Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa. Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!”
Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”
Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere. Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.”
Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ.
Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.”
Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị,
“ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ,
igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’
Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.”
Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru.
Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.” Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri. Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.”
Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya. O kwuru sị, “Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa? Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.”
Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ. Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya.
Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.”