Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha. Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya, ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.
Gụọ Mak 1
Geere nke a ntị Mak 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Mak 1:40-45
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo