Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Matiu 26:17-46

Matiu 26:17-46 BIU

Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?” Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’ ” Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ. Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ. Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.” Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?” Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye. Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.” Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.” Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a. Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie. Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.” Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’ Ma mgbe e mere ka m si nʼọnwụ bilite, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.” Pita sịrị, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị gbalaga, agaghị m ahapụ gị.” Jisọs sịrị, “Nʼezie agwa m gị, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Ma Pita kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru. Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.” Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri. Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche.” Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.” Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa? Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.” Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.” Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ. Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ. Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!”