Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ. Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya. Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya? Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị. “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”
Gụọ Matiu 16
Geere nke a ntị Matiu 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Matiu 16:24-28
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo