Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Matiu 15:1-20

Matiu 15:1-20 BIU

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu si Jerusalem bịakwute Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nʼomenaala ndị okenye? Ha anaghị akwọ aka ha tupu ha erie nri.” Ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu? Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.’ Ma unu na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ ‘onyinye dịrị Chineke.’ Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu. Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Mgbe o kwuru sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’   ” Mgbe ahụ, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ, sị ha, “Geenụ ntị, ghọtakwanụ. Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nʼọnụ na-emerụ ya, kama ọ bụ ihe sị nʼọnụ onye ahụ pụta na-emerụ ya.” Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwa na obi adịghị ndị Farisii mma nʼihi okwu ahụ i kwuru?” Ma ọ zara sị ha, “Osisi ọbụla Nna m nke eluigwe na-ejighị aka ya kụọ ka a ga-ehopu. Ya mere, unu echegbula onwe unu, nʼihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì ibe ya ha abụọ adaba nʼime olulu.” Pita sịrị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu a pụtara.” Ọ jụrụ ha sị, “Unu ọ ka dị ka ndị na-enweghị nghọta? Ọ bụ na unu aghọtaghị na ihe ọbụla nke na-aba nʼọnụ na-aga nʼime afọ, sịkwa nʼebe ahụ a nyụpụ ya nʼụlọ nsị? Ma ihe si mmadụ nʼọnụ pụta na-esi ya nʼobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ. Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu. Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupu o rie nri, maọbụ na ọ kwọghị.”