Pailet kpọkọtara ndịisi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ ndị ọzọ sị ha, “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka otu onye nʼime ndị na-akpali ndị mmadụ inupu isi. Ajụọla m ya ajụjụ nʼihu unu ma achọpụtaghị m ihe ọbụla nke unu kwesiri iji boo ya ebubo. Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ. Ya mere aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.” Ma ọ dị mkpa na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ nʼoge mmemme.
Ma igwe mmadụ ahụ tiri mkpu nʼotu olu sị, “Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas.” (Onye a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara dapụtara nʼobodo ahụ, nakwa nʼihi igbu mmadụ.)
Dị ka ọ gbalịsịrị ike ịhapụ Jisọs, Pailet gwakwara ha okwu ọzọ. Ma ha niile tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
Ọ sịrị ha na nke ugboro atọ, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? O nweghị ihe ọbụla m chọpụtara nʼaka ya kwesiri iwetara ya ọnwụ. Ya mere aga m ata ya ahụhụ, hapụ ya.”
Ma ha nọgidere na-eti mkpu nʼoke olu ka a kpọgide ya nʼobe, nʼikpeazụ olu iti mkpu ha karịrị. Ya mere Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ. Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ nke a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara na igbu mmadụ, ma nyefee ha Jisọs nʼaka.
Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ. Igwe mmadụ dị ukwuu soro ya tinyekwara ụmụ nwanyị bụ ndị tiri mkpu akwa ma ruokwara ya ụjụ. Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu. Nʼihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzị na-adịrị ụmụ nwanyị aga, akpanwa ndị na-amụghị nwa, na ara ndị na-enweghị onye ṅụrụ ha.’ Mgbe ahụ,
“ ‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!”
Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!” ’
Ya mere, ọ bụrụ na ha mee ọhịa otu a mgbe ahịhịa dị ndụ dị na ya, gịnị ga-emekwanụ mgbe ọ kpọrọ nkụ?”
Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya. Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya. Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.”
Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka, ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.”
Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ:
Onye a bụ Eze ndị Juu.
Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.”
Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya. Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.”
Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.”