Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Levitikọs 7:28-38

Levitikọs 7:28-38 BIU

ONYENWE ANYị gwakwara Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla wetaara ONYENWE ANYị onyinye aja udo aghaghị iweta ụfọdụ nʼime onyinye ahụ dịka onyinye pụrụ iche nye Onyenwe anyị. Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu ONYENWE ANYị. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu ONYENWE ANYị dịka aja mfufe. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye. Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya. Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ” Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu ONYENWE ANYị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja. Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka ONYENWE ANYị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo. ONYENWE ANYị nyere Mosis iwu ndị a nʼugwu Saịnaị nʼụbọchị ahụ o nyere ụmụ Izrel iwu sị ha, wetara ONYENWE ANYị onyinye nʼọzara Saịnaị.