Abụ m onye hụrụla ahụhụ site
na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe ONYENWE ANYị.
O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa
nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m,
mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ,
ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
O busola m agha,
jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
O meela ka m biri nʼọchịchịrị
dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ;
o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya,
ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile,
o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche,
na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ,
hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
Ọ dọọla ụta ya
mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya
gbapuo m obi.
Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile;
ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ,
meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
O meela ka m jiri okwute tajisie eze m,
o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
Enweghị m udo,
echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa.
Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka ONYENWE ANYị nweta.”
Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m,
ya na ihe ilu na oluilu.
Mgbe m na-echeta ya,
obi m na-ada mba nʼime m.
Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m
nke na-eme ka m nwee olileanya.
Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke ONYENWE ANYị na-emeghị ka anyị gwụsịa,
nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;
ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
Mkpụrụobi m na-ekwu, “ONYENWE ANYị bụ oke m,
nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
ONYENWE ANYị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,
e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ
chere nzọpụta nke ONYENWE ANYị.