Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Joshua 9:16-27

Joshua 9:16-27 BIU

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site na mgbe ụmụ Izrel na ndị Gibiọn gbara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ndị Gibiọn bụ ndị agbataobi ha, ndị bi ha nso. Ya mere, ndị Izrel buliri ije gaa ịchọpụta ebe ndị a si bịa, si otu a bịaruo obodo ha niile nʼụbọchị nke atọ. Aha obodo ha bụ Gibiọn, Kefira, Beerọt na Kiriat Jearim. Ma ndị Izrel ebusoghị ha agha nʼihi na ndịisi nzukọ Izrel ejirila aha ONYENWE ANYị, Chineke Izrel ṅụọ iyi idebe ha ndụ. Ma nzukọ Izrel niile tamuru ntamu megide ndịisi ha nʼihi ọgbụgba ndụ a. Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu ONYENWE ANYị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla. Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe ONYENWE ANYị ga-adakwasị anyị niile.” Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ. Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso? Ugbu a, unu ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, unu aghọọla ndị ohu anyị, ndị ga na-awara anyị nkụ mgbe niile, na ndị ga na-ekutere anyị mmiri nke anyị ga-eji rụọ ọrụ nʼụlọnsọ Chineke m.” Ha zara Joshua sị, “Anyị mere nke a nʼihi na agwala anyị na ONYENWE ANYị Chineke gị nyere Mosis iwu sị ya merie ala ndị a niile, ma kpochapụ ndị niile bi nʼime ya. Ọ bụ nke a mere ụjọ ji tụọ anyị. Ọ bụkwa ya mere anyị ji mee ihe dị otu a, nʼihi ichebe ndụ anyị. Ma ugbu a, anyị dị unu nʼaka. Unu nwere ike ime anyị ihe dị unu mma.” Nʼihi nke a, Joshua ekweghị ka ndị Izrel gbuo ha. Joshua mere ha ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri nye ụmụ Izrel, na ịhụkwa banyere ihe ndị dị mkpa nʼebe ịchụ aja ONYENWE ANYị, nʼebe ahụ ONYENWE ANYị ga-ahọpụta. Ọ bụkwa nke a ka ha bụ ruo taa.