Ụmụ Kohat ndị fọdụrụ, ndị agbụrụ Livayị ka e kenyere obodo anọ ndị a site nʼaka ebo Ifrem.
E sitere nʼala ugwu ugwu Ifrem nye ha:
Shekem, nke bụ obodo mgbaba na Gaza, Kibzaim na Bet-Horon, tinyere ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
Ha sitere nʼala ndị ebo Dan keta obodo anọ ndị a:
Elteke na Gibeton, Aijalon na Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
Ọkara ebo Manase nyere ha obodo abụọ,
Teanak, Gat Rimọn na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha.
Ya mere, obodo niile na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ e nyere ndị fọdụrụ nʼikwu Kohat dị iri.
Ụmụ Geshọn, ndị agbụrụ Livayị, ketara obodo abụọ ndị a, ya na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
Ọkara ebo Manase nyere:
Golan, nʼime Bashan, nke bụ obodo mgbaba, na Be Eshtera.
Ebo Isaka nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ,
Kishiọn, Daberat, Jamut na En-Ganim, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
Ebo Asha nyekwara ha obodo anọ. Ha bụ,
Mishal, Abdon, Helkat na Rehob, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
Ebo Naftalị nyere ha obodo atọ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Obodo ndị a bụ,
Kedesh, nʼime Galili, nke bụkwa obodo mgbaba, Hamot Doa na Katan.
Obodo iri na atọ, na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ka e nyere ikwu Geshọn.
Ndị ikwu Merari, bụ ụmụ ụmụ Livayị fọdụrụ nwetara site nʼaka:
Ebo Zebụlọn,
Jokneam, Kata, Dimna na Nahalal, obodo anọ tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
Ebo Ruben nyere ha obodo anọ:
Beza, Jahaz, Kedemot, Mefaat na ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ kpaa nri.
Ebo Gad nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ,
Ramọt, nʼime Gilead nke bụ obodo mgbaba, Mahanaim, Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị.
Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ. Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri.
Ya mere, ONYENWE ANYị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya. ONYENWE ANYị nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na ONYENWE ANYị nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha. O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile ONYENWE ANYị kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha.