Mgbe ahụ, Job zara ONYENWE ANYị sị: “Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa. Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. “Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’ Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị. Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”
Gụọ Job 42
Geere nke a ntị Job 42
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Job 42:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị