Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi? Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ. Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.” A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya, apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha. A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya, A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya. Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi. A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya. Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi? E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ, e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe. Mbibi na ọnwụ na-asị; “Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.” Chineke ghọtara ụzọ ya, naanị ya makwara ebe obibi ya dị. Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe. Mgbe o hiwere ike nke ikuku, tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ, mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku, mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya, meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya. Ọ sịrị mmadụ, “Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”
Gụọ Job 28
Geere nke a ntị Job 28
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Job 28:12-28
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị