Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?” Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.” Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu? Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi? E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.” Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha, “Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?” Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.” [Akwụkwọ ndị mbụ na ọtụtụ ndị ochie gbara akaebe enweghị amaokwu nke iri ise na atọ nʼakwụkwọ Jọn isi nke asaa ruo Jọn isi asatọ amaokwu nke iri na otu Jọn 7:53–8:11. Ụfọdụ akwụkwọ na-edebanye amaokwu ndị a, nʼebe o zuruoke maọbụ ụfọdụ nʼime ya, ma o bụrụ na ha edechaa Jọn isi asaa amaokwu nke iri atọ na isii, Jọn 7:36, Jọn 21:25, Luk 21:38 maọbụ Luk 24:53.] Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.
Gụọ Jọn 7
Geere nke a ntị Jọn 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Jọn 7:45-53
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo