Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Jọn 11:1-17

Jọn 11:1-17 BIU

Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị. Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa. Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, “Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa.” Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.” Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya. Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ. Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa.” Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?” Jisọs zara, “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ. Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-adị mma.” Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu. Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, “Lazarọs anwụọla. Ma nʼihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nʼebe ahụ, ka unu nwe ike kwere. Ma bịanụ ka anyị gakwuru ya.” Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, “Ka anyị gakwanụ ka anyị soro ya nwụọ.” Mgbe Jisọs rutere, ọ chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nʼili ụbọchị anọ.