Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe ONYENWE ANYị nọ bịakwute Jeremaya. “Guzo nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọ ONYENWE ANYị kwusaa ozi a nʼebe ahụ, “ ‘Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYị, unu ndị Juda niile, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a niile na-abata ife ONYENWE ANYị ofufe. Ihe ndị a bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu. Mezienụ ụzọ unu na omume unu niile, m ga-ekwe ka unu biri nʼebe a. Unu atụkwasịla uche unu nʼokwu aghụghọ niile a na-agwa unu na-asị, “Nke a bụ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị!” Ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu guzozie, ọ bụrụ na unu emesoo ibe unu mmeso nʼụzọ ikpe ziri ezi, ọ bụrụ na unu ahapụ imegbu ndị ọbịa, na ndị na-enweghị nna, maọbụ nwanyị di ya nwụrụ; ọ bụrụ na unu ajụ iwufu ọbara onye aka ya dị ọcha nʼebe a, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaso chi ndị ọzọ nke na-ewetara unu nsogbu, mgbe ahụ, aga m ekwere ka unu biri nʼebe a, nʼala a m nyere nna nna unu ha, ruo mgbe ebighị ebi. Ma lee, ihe unu na-eme ugbu a bụ ịtụkwasị uche unu nʼokwu aghụghọ nke na-enweghị isi.
Gụọ Jeremaya 7
Geere nke a ntị Jeremaya 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Jeremaya 7:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo