Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Jeremaya 42:1-12

Jeremaya 42:1-12 BIU

Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo ONYENWE ANYị Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole. Kpee ekpere ka ONYENWE ANYị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.” Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere ONYENWE ANYị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile ONYENWE ANYị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.” Ha sịrị Jeremaya, “Ka ONYENWE ANYị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile ONYENWE ANYị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị. Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere ONYENWE ANYị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.” Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu ONYENWE ANYị ruru Jeremaya ntị. Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị: ‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu. Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya. Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’