Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘ONYENWE ANYị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’ Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha. Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”
Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda. Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri. “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,
“ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha,
ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’
Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.
“Lee, oge na-abịa,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị
nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,
nakwa ụlọ Juda.
Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ
mụ na nna nna ha gbara,
mgbe ahụ m jidere ha nʼaka
site nʼala Ijipt dupụta ha,
nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,
ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,”
Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara.
“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba
mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka ONYENWE ANYị kwupụtara.
“Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,
aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.
Aga m abụ Chineke ha,
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.
Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara ONYENWE ANYị,’
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.”
Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya.
“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru,
bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ
mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,
onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu
ka ha na-enye ihe nʼanyasị,
onye na-akpali oke osimiri,
na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.
Aha ya bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara,
“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,
ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,
ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”
Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru,
“Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe,
na ịdị omimi nke ntọala ụwa,
ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel,
nʼihi ihe niile ha mere.”
Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri.
“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ. Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa. Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye ONYENWE ANYị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”