Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka ONYENWE ANYị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, ONYENWE ANYị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.” Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.”
Gụọ Ndị Ikpe 6
Geere nke a ntị Ndị Ikpe 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ndị Ikpe 6:13-15
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo