Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ndị Ikpe 6:11-24

Ndị Ikpe 6:11-24 BIU

Mmụọ ozi ONYENWE ANYị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya. Mmụọ ozi ONYENWE ANYị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, ONYENWE ANYị nọnyeere gị.” Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka ONYENWE ANYị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, ONYENWE ANYị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.” Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.” Ma ONYENWE ANYị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.” Gidiọn zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nye m ihe ịrịbama nke ga-egosi na ọ bụ gị nʼezie na-agwa m okwu. Biko esikwala ebe a pụọ ruo mgbe m lọghachiri weta onyinye m ga-eche nʼihu gị.” ONYENWE ANYị zara sị ya, “Aga m eche ruo mgbe ị lọghachiri.” Gidiọn mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, sie ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha, nke ihe na-eko achịcha na-adịghị nʼime ya. Emesịa, o tinyere anụ ahụ nʼime nkata, wụnyekwa ofe nʼime ite, buru ha jekwuru Mmụọ ozi ahụ, ebe ọ nọ na-eche ya nʼokpuru osisi ook ahụ. Mmụọ ozi nke Chineke sịrị ya, “Were anụ a na ogbe achịcha ahụ na-ekoghị eko, tụkwasị ha nʼelu nkume a, wụpụkwa ofe ahụ.” Gidiọn mere otu a. Mgbe Mmụọ ozi ONYENWE ANYị ahụ metụrụ ọnụ mkpanaka ahụ nke dị nʼaka ya nʼelu anụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko. Ọkụ sitere nʼoke nkume ahụ nwuru, rechapụ anụ ahụ na achịcha nʼekoghị eko ahụ. Mmụọ ozi nke ONYENWE ANYị ahụ gbara barịị site nʼihu ya. Mgbe Gidiọn ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi nke ONYENWE ANYị, o tiri mkpu akwa sị, “Ewoo! Onyenwe m ONYENWE ANYị! Ahụla m Mmụọ ozi ONYENWE ANYị ihu na ihu!” Ma ONYENWE ANYị sịrị ya, “Udo dịrị gị, atụla egwu! Ị gaghị anwụ.” Ya mere, Gidiọn wuuru ONYENWE ANYị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, kpọọ ya, ONYENWE ANYị bụ Onye Udo. Ụlọ nchụaja ahụ dịkwa nʼime obodo Ofra nʼala ndị Abieza ruo taa.