Mmụọ ozi ONYENWE ANYị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu, unu na ndị bi nʼobodo ahụ agbakwala ndụ ọbụla, kama unu ga-etitu ebe ịchụ aja ha.’ Ma unu erubeghị isi nʼokwu a, gịnị mere unu emeghị nke a? Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa.’ ” Mgbe Mmụọ ozi ONYENWE ANYị ahụ kwusiri okwu ndị a, ụmụ Izrel niile kwara akwa nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Bokim. Ha chụụrụ ONYENWE ANYị aja nʼebe ahụ. Mgbe Joshua zilagasịrị ndị Izrel niile, onye ọbụla nʼime ha gara nʼihe nketa ya, inweta ya, dịka ebo ọbụla dị nʼIzrel si dị. Ndị Izrel fere ONYENWE ANYị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, bụkwa ndị hụrụ ọrụ ukwuu niile nke ONYENWE ANYị rụụrụ ndị Izrel. Ma Joshua, nwa Nun, onyeozi ONYENWE ANYị nwụrụ, mgbe ọ gbara otu narị afọ, na afọ iri. E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, nʼobodo Timnat Heres, nʼala ugwu ugwu nke ebo Ifrem, nʼụzọ mgbago ugwu Gaash. Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị ONYENWE ANYị maọbụ ihe ndị nke o mere nye ụmụ Izrel.
Gụọ Ndị Ikpe 2
Geere nke a ntị Ndị Ikpe 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ndị Ikpe 2:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo