Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Aịzaya 40:18-31

Aịzaya 40:18-31 BIU

Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri? Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha. Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure. Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma, onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada. Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa? Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu. Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana. Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa, were ya mere ebe obibi ya. Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa, mee ha ka ha ghọọ ihe efu. Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute. Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute, mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala, mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha, bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. “Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ. Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu. Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị ONYENWE ANYị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?” Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? ONYENWE ANYị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya. Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume. Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa, ma ndị niile olileanya ha dị na ONYENWE ANYị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.