Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m, onye chọrọ nke a nʼaka unu? Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m. Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ. Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile, apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru. Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ a kara aka asị. Ha bụụrụ m ibu arọ, ike agwụkwala m ibu ha. Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara! Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. “Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe ONYENWE ANYị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ ONYENWE ANYị ekwula ya.
Gụọ Aịzaya 1
Geere nke a ntị Aịzaya 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Aịzaya 1:12-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo