“Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’
“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,
nʼihi na ọ bụghị nwunye m,
mụ onwe m abụkwaghị di ya.
Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,
ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.
Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,
aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.
Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara,
ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,
were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,
nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,
ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.
Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,
ndị na-enye m nri na mmiri,
ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;
aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha.
Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha.
Mgbe ahụ, ọ ga-asị,
‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m,
nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’
Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,
na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,
na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile
nke o ji na-efe Baal.
“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,
na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.
Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,
nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya
nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,
ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;
ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,
nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,
nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;
aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,
anụ ọhịa ga-eripịa ha.
Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile
bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,
ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,
pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,
ma chezọọ m,” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya.