Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa itoolu, nke afọ abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu ONYENWE ANYị bịakwutere onye amụma, bụ Hegai. “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu. Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’ ” Ndị nchụaja zara sị: “Mba!” Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?” Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.” Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “ ‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị kwuru.
Gụọ Hegai 2
Geere nke a ntị Hegai 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Hegai 2:10-14
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo