Mgbe Josef lepụrụ anya hụ Benjamin nʼetiti ha, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya sị, “Duru ndị ikom ndị a gaa nʼụlọ. Gbuo anụ, kwadoo nri, nʼihi na ndị a ga-eso m rie nri ehihie.”
Odibo a mere dịka Josef ziri ya. O duuru ndị ikom ndị ahụ gaa nʼụlọ Josef. Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.”
Ha bịaruru odibo Josef ahụ nso gwa ya okwu nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ. Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, anyị bịara ebe a nʼoge mbụ ịzụ ihe oriri. Ma, mgbe anyị rutere ebe anyị nọrọ ọnọdụ abalị, anyị meghere akpa anyị, chọpụta ego anyị kwụrụ nʼihi nri ahụ anyị zụrụ ka ọ dị nʼọnụ akpa anyị nʼotu na otu. E sepụkwaghị ya ihe ọ bụla. Ya mere, anyị weghachiri ya nʼoge a. Anyị jikwa ego ọzọ anyị ga-eji zụọ ihe oriri. Ma anyị amaghị onye tinyere ego ahụ nʼime akpa anyị.”
Odibo ahụ zara sị ha, “Udo dịrị unu, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu, na Chineke nna unu enyela unu akụ zoro ezo nʼime akpa unu. Ego unu kwụrụ ruru m aka.” Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ha gaa kpọpụta Simiọn.
Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri. Mgbe ahụ, ụmụ Jekọb kwadoro onyinye ịnata ihuọma ha ji bịa, nke ha ga-enye Josef ma ọ bata nʼetiti ehihie, nʼihi na ha anụla na ha ga-eri nri nʼebe ahụ.
Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya. Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.”
Ha zaghachiri sị ya, “Ahụ dị ohu gị bụ nna anyị. Ọ ka nọ ndụ.” Ha hulatara isi ha, kpọọ isiala nye ya.
Mgbe Josef welitere anya ya elu hụ nwanne ya Benjamin, onye bụ nwanne afọ ya, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye a ọ bụ nwanne unu nke nta ahụ unu gwara m ihe banyere ya?” Tupu ha asaa ya ihe ọbụla, o lere Benjamin anya sị ya, “Ka amara Chineke dịrị gị, nwa m nwoke.” Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa.
Emesịa, ọ sara ihu ya, pụta, jisie onwe ya ike nye odibo ya iwu ka o bute nri ahụ.
Ha doziiri ya nri nke ya iche, doziekwara ụmụnne ya nri nke ha iche. Otu a kwa, ha dozikwaara ndị Ijipt ya na ha na-erikọ nri, nri nke ha iche. Nʼihi na ọ bụ ihe arụ nʼanya ndị Ijipt na ha na ndị Hibru ga-erikọta nri ọnụ. Ma mgbe e nyere ha ọnọdụ nʼihu Josef, e mere ka ha nọdụ dịka ha si tọọ ibe ha. Nke ọkpara buru ụzọ nọdụ, onye na-eso ya anọdụkwa. Otu a ka ha niile siri nọdụ ruo nʼonye ikpeazụ nʼime ha. Ha lerịtara onwe ha anya nʼihi na o juru ha anya. O sitekwara na nri e doziri ya nyebinye ha nri. Nri e nyere Benjamin dị ukwuu okpukpu ise karịa nri nke e nyere ha niile. Ha na ya riri, ṅụọkwa nʼuju.