Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.” Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ. O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile.
Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.” Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania. Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On, ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt.
Josef gbara iri afọ atọ mgbe o bidoro iguzo nʼihu Fero eze Ijipt. O si nʼihu Fero pụọ, malite ijegharị ebe niile nʼala Ijipt. Nʼafọ asaa ahụ nke a na-eriju afọ, ala mepụtara nri nʼebe ọ dị ukwuu. Nʼime afọ asaa ndị a nke nri juru ebe niile nʼIjipt, Josef chịkọtara nri niile nke si nʼubi, ma chekwaa ha nʼụlọ e wuru maka iche nri nʼobodo niile ahụ. Nʼobodo ọbụla, ka ọ na-etinye ihe oriri nke si nʼubi gbara ya gburugburu. Josef chekwara ọka dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. A kwụsịrị ịgụ ha ọnụ nʼihi na ha hiri nne nke ukwuu nke na ha enweghị ọnụọgụgụ.
Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ. Josef gụrụ ọkpara ya Manase, nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.” Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem. Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”
Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga. Afọ asaa nke ụnwụ bidoro bịawa dịka Josef kwuru. Ụnwụ nọ nʼobodo niile, ma nʼala Ijipt niile nri dị. Ka agụ jidere ala Ijipt niile, ndị mmadụ tikuru Fero ka o nye ha nri. Ma Fero gwara ndị Ijipt niile, “Jekwurunụ Josef. Ihe ọbụla ọ gwara unu meenụ ya.”
Mgbe ụnwụ ahụ gbasara ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, Josef meghepụrụ ụlọ ichebe nri niile bido iresi ndị Ijipt nri, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Ijipt niile. Mba niile bịara Ijipt ịzụ nri site nʼaka Josef nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼụwa niile.