Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ. Nʼihi na Chineke maara na ọ bụrụ na unu erie ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-amata ezi ihe na ajọ ihe.” Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie. Mgbe ahụ, anya ha abụọ meghere, ha chọpụtara na ha gba ọtọ. Ya mere, ha dụkọtara ahịhịa fiig, jiri ya mere onwe ha akwa. Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda njegharị ONYENWE ANYị Chineke nʼogige ahụ nʼoge uhuruchi, ha zoro onwe ha site nʼebe ONYENWE ANYị Chineke nọ nʼetiti osisi ndị dị nʼogige ahụ. Ma ONYENWE ANYị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?” Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.”
Gụọ Jenesis 3
Geere nke a ntị Jenesis 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Jenesis 3:4-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo