Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Jenesis 21:8-21

Jenesis 21:8-21 BIU

Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri. Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo, ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.” Okwu a wutere Ebraham nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke Ishmel na-emetụ ya nʼobi. Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha. Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.” Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba. Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa. Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa. Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina. Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.” Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ. Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma. Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt.