Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu ONYENWE ANYị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, ONYENWE ANYị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, “Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘ONYENWE ANYị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha.
Gụọ Ezra 1
Geere nke a ntị Ezra 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ezra 1:1-3
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị