Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Izikiel 36:16-38

Izikiel 36:16-38 BIU

Ọzọkwa, okwu nke ONYENWE ANYị rutere m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile. Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m, nʼihi na ha na-awụsi ọbara nʼala ahụ, jirikwa arụsị ha na-emerụ ya. Achụsasịrị m ha na mba dị iche iche. Otu a ka m si kpee ha ikpe nʼihi ụzọ ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha. Ma ebe niile ha gara nʼetiti mba niile, ha mere ka aha nsọ m gharakwa ịdị nsọ, nʼihi na a na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ndị a bụ ndị nke ONYENWE ANYị, ma agbanyeghị nke a, ha sitere nʼala ya pụọ.’ Ihe na-ewutekwa m bụ aha nsọ m, nke ụlọ Izrel mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile bụ ebe ha gara. “Ya mere, gwa ụlọ Izrel, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwuru: Ọ bụghị nʼihi na unu, ụlọ Izrel, ka m ji na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ nʼihi aha nsọ m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile dị iche iche ebe ndị unu gara. Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha. “ ‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu. Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile. Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ. Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu. Unu ga-ebikwa nʼala ahụ nke m nyere nna unu ha. Unu ga-abụ ndị m, aga m abụkwa Chineke unu. Aga m azọpụta unu site na-adịghị ọcha unu niile. M ga-akpọ mkpụrụ ubi, mee ka o rie nne nke ukwu, agaghị m emekwa ka ụnwụ dakwasị unu ọzọ. Aga m emekwa ka mkpụrụ osisi na ihe owuwe ubi baa ụba nke ukwuu, ka unu gharakwa ịnata ihere ọzọ nʼihi ụnwụ, nʼetiti mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, unu ga-echeta ụzọ ọjọọ unu niile na omume ọjọọ unu niile, unu ga-asọkwa onwe unu oyi nʼihi mmehie unu na ihe arụ niile unu mere. Ma achọrọ m ka unu mata na ọ bụghị nʼihi mma unu ka m ji na-eme ihe ndị a. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwupụtara. Unu ụlọ Izrel, ihere kwesiri ime unu nʼihi omume ọjọọ unu mere. “ ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwuru: Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ka ị dị ọcha site na mmehie gị niile, aga m eme ka unu lọghachi nʼobodo unu biri, a ga-ewugharịkwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu. Ala ubi ndị ahụ nke tọgbọrọ nʼefu agaghị atọgbọkwa nʼefu nʼihu anya ndị na-agafe agafe. A ga-akọkwa ha niile. Mgbe ahụ, ha ga-asị, “Ala a, nke naara atọgbọ nʼefu, aghọọla ubi a gbara ogige, nke yiri ogige Iden. Leekwa na obodo niile ndị ahụ e tikpọrọ etikpọ, ka e wuzikwara, werekwa mgbidi gbaa ha ogige. Ugbu a, ndị mmadụ jupụtakwara nʼime ha.” Mgbe ahụ, mba niile gbara unu gburugburu, bụ ndị fọdụrụ, ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị wuziri ebe niile e tikpọrọ etikpọ, kụọkwa mkpụrụ nʼebe niile tọgbọrọ nʼefu. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị, ekwuola, aga m emekwa ya.’ “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwuru, ọzọkwa, aga m ege ntị, zaa ekpere ụlọ Izrel, mezuoro ha arịrịọ ha. Aga m eme ka ha baa ụba dịka igwe anụ ụlọ, dịka igwe anụ ụlọ, nke na-ejupụta na Jerusalem nʼoge mmemme ya niile a kara aka. Nʼụzọ dị otu a, obodo niile e tikpọrọ etikpọ ga-ejupụtakwa na mmadụ ọzọ. Mgbe ahụ ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị.”