Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.” Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie.
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ.
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile. Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel. Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị. Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike. Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha. Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.”
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị. Jekwuru ndị gị a dọtara nʼagha nọ na mba ọzọ, sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị na-ekwu,’ Gwa ha ya, ma ha gere gị ntị ma ha egeghị gị ntị.”
Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke ONYENWE ANYị sị nʼọnọdụ ya bilie. Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha. Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka ONYENWE ANYị dịkwa ike nʼahụ m. A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.