Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọpụpụ 5:1-14

Ọpụpụ 5:1-14 BIU

Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’ ” Fero zara sị, “Onye ka ONYENWE ANYị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.” Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ ONYENWE ANYị Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.” Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!” Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.” Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị, “Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha. Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’ Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.” Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ. Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’ ” Ya mere ndị ha gbasasịrị nʼala Ijipt niile ịchịkọta okporo ahịhịa ha ji akpụ brik. Ndị na-achị ha nọgidere na-akwagide ha sị ha, “Rụchaanụ ọrụ unu kwesiri ịrụ nʼụbọchị dịka unu si arụ ya mgbe a na-enye unu ahịhịa.” Ndịisi ọrụ Fero malitere iti ndị Izrel ha họpụtara maka inyere ha aka ilekọta ndị ọrụ ihe, na-ajụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu akpụtaghị oke ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụta ụnyaahụ maọbụ taa?”

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Meberè Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara