Ọpụpụ 32:7-9
Ọpụpụ 32:7-9 BIU
Nʼoge ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Gbada ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i dupụtara site nʼIjipt emerụọla onwe ha. Nʼotu ntabi anya a, ha ahapụla ụzọ m niile. Ha akpụọlara onwe ha arụsị nwa oke ehi, nke ha na-efe ofufe, nke ha chụkwaara aja nye. Ha kwukwara sị, ‘Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke dupụtara unu site nʼala Ijipt.’ ” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sịrị Mosis, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike, na ndị na-enupu isi.

