“Ọ bụrụ na mmadụ ezuru ehi maọbụ atụrụ gbuo ya, maọbụ ree ya, ọ ga-akwụghachi ehi ise nʼọnọdụ ehi ahụ. Nʼọnọdụ otu atụrụ o zuuru, ọ ga-akwụghachi atụrụ anọ.
“Ọ bụrụ na e jide onye ohi mgbe ọ na-egbuka ụlọ onye ọzọ, ọ bụrụkwa na e tigbuo ya, mee ka ọ nwụọ, iwu ejideghị onye ahụ gburu ya. Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya.
“Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji. Ọ bụrụ na a chọta ihe o zuru nʼaka ya, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, ọ ga-akwụghachi ọnụahịa ya okpukpu abụọ.
“Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya hapụ anụ ụlọ ya ka ọ gaa taa nri nʼubi maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ nʼubi onye ọzọ, onyenwe anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe niile anụ ụlọ ya mebiri, ma ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ aghaghị ịbụ ihe ọrụ ubi dị mma nke o si nʼubi ya maọbụ nʼubi vaịnị ya wepụta.
“Ọ bụrụ na ọkụ na-agba banye nʼogwu, repịa ogbo ọka dị nʼubi mmadụ maọbụ ọka guzoro eguzo, ma ọ bụkwanụ ọhịa niile, onye ahụ tinyere ọkụ ahụ ga-akwụghachi ụgwọ ihe ahụ niile nke ọkụ repịara.
“Ọ bụrụ na mmadụ enye enyi ya maọbụ onye agbataobi ya ego, maọbụ ihe ọbụla ka o debere ya, ma onye ohi agaa zuru ya site nʼụlọ ya, a si na e jide onye ohi dị otu a, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuru okpukpu abụọ. Ọ bụrụ na a chọpụtaghị onye ohi ahụ, onye nwe ụlọ ahụ aghaghị ịbịa nʼihu Chineke, ka a chọpụta maọbụ ya nʼonwe ya setịpụrụ aka were ihe ahụ, bụ akụ nke onye ọzọ kpatara. Ọ bụrụ na onye ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, maọbụ atụrụ ya, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla furu efu, nke mmadụ na-asị, ‘Nke a bụ ya.’ Mmadụ abụọ ndị a ga-aga nʼihu ndị ikpe. Onye ọbụla ndị ikpe a mara ikpe ga-akwụghachi ibe ya ụgwọ okpukpu abụọ.
“Ọ bụrụ na anụ ụlọ mmadụ nyere onye agbataobi ya nʼaka idebe anwụọ, maọbụ merụọ ahụ, maọbụ gbafuo, ma anụ ụlọ ahụ ọ bụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ anụ ụlọ ọzọ, ọ bụrụ na ọ dịghị onye hụrụ mgbe ihe ndị a dakwasịrị anụ ụlọ ahụ, mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu ONYENWE ANYị. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla. Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya. Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.
“Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya. Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ.