Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọpụpụ 20:1-17

Ọpụpụ 20:1-17 BIU

Chineke kwuru okwu ndị a niile sị: “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu. “Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m. Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa. Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị. Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu. Gị ejikwala aha ONYENWE ANYị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na ONYENWE ANYị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị. Cheta ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ. Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile. Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke ONYENWE ANYị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị. Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka ONYENWE ANYị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a ONYENWE ANYị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike. Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka ONYENWE ANYị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị. Gị egbula mmadụ. Gị akwala iko. Gị ezula ohi. Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị. Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”