Nʼoge a, otu nwoke onye Hibru si nʼebo Livayị, gakwara lụọ otu nwaada onye Livayị. Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ. Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto. Nwanne nwantakịrị ahụ, nke nwanyị, gakwara guzo nʼebe dị anya na-eche nwantakịrị ahụ nche, ịhụ ihe ga-eme ya.
Gụọ Ọpụpụ 2
Geere nke a ntị Ọpụpụ 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ọpụpụ 2:1-4
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo