Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt. Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na ONYENWE ANYị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.”
ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu. Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.”
Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ ONYENWE ANYị dupụtara unu site nʼala Ijipt. Unu ga-ahụkwa ebube ONYENWE ANYị nʼụtụtụ echi, nʼihi na ONYENWE ANYị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?” Mosis kwukwara sị, “Mgbe ONYENWE ANYị nyere unu anụ unu ga-eri nʼanyasị a, nyekwa unu achịcha ga-eju unu nʼụtụtụ, unu ga-amata na ọ bụ ONYENWE ANYị, nʼihi ọ nụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ? Ọ bụghị anyị ka unu na-atamu megide kama ọ bụ ONYENWE ANYị ka unu na-atamu megide.”
Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn okwu sị ya, “Gwa nzukọ Izrel niile okwu sị ha, ‘Pụtanụ bịa nʼihu ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ nụla ntamu unu.’ ”
Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube ONYENWE ANYị ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii.
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu.’ ”
Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile. Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?”
Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha ONYENWE ANYị nyere unu ka unu rie. Ihe ndị a bụ iwu ONYENWE ANYị nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’ ”
Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta. Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị.