Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọpụpụ 15:1-18

Ọpụpụ 15:1-18 BIU

Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru ONYENWE ANYị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku ONYENWE ANYị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri. “ONYENWE ANYị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu. Onye na-ebu agha ka ONYENWE ANYị bụ. Nʼezie, aha ya bụ ONYENWE ANYị. Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie. Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume. Aka nri gị ONYENWE ANYị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, ONYENWE ANYị na-etipịasị ndị iro. “Nʼoke ike nke ịdị elu gị, Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị. I zipụrụ iwe gị dị ọkụ, o repịara ha dịka igbugbo ọka. I sitere na nkuume nke oghere imi gị, mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ. Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi; ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri. Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’ Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta, osimiri riri ha, ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ dịka igwe. Onye dịka gị ONYENWE ANYị, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ. Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube? “I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile. Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ. Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị. Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze; oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, ONYENWE ANYị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara. Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, ONYENWE ANYị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya. “ONYENWE ANYị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”