Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Esta 1:1-12

Esta 1:1-12 BIU

Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa (127), nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush. Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa ebe ocheeze ya dịkwa. Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị. Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ (180). Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya. Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta. Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya. E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị. E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ. Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị Vashti, kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses. Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma. Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.