Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe. Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu, oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi, oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu, oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ, oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi, oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu, oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo. Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ? Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke. O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ. Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.
Gụọ Ekiliziastis 3
Geere nke a ntị Ekiliziastis 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ekiliziastis 3:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị