Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe, na ịyị ara na nzuzu. Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme, karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ? Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị. Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu. Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu. Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
Gụọ Ekiliziastis 2
Geere nke a ntị Ekiliziastis 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ekiliziastis 2:12-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị