Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ. Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ. Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi, ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie. Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya, nʼihi na o maghị ihe. Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ. Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị, ahapụla ọnọdụ gị, nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ. Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie. Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha. Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu. Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu. Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.
Gụọ Ekiliziastis 10
Geere nke a ntị Ekiliziastis 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ekiliziastis 10:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo