Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime. Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.” Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?” Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha.
Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi. Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ ONYENWE ANYị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka ONYENWE ANYị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta.
Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha, agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta.
Ana m akpọku eluigwe na ụwa taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ ka ị hụ ONYENWE ANYị bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb.