Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Diuteronomi 30:1-10

Diuteronomi 30:1-10 BIU

Mgbe ihe ndị a niile ga-emezu nʼebe unu nọ, ya bụ, ngọzị niile na ọbụbụ ọnụ niile m gụpụtara nʼihu unu, ọ bụrụ na unu ga na-atụgharị uche na ha nʼetiti mba ndị ahụ ONYENWE ANYị Chineke unu ga-achụba unu, ọ bụrụkwa na unu ekpebie nʼobi unu nʼoge ahụ ịlọghachikwute ONYENWE ANYị Chineke unu, ọ bụrụ na unu, na ụmụ unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile mezuo iwu ndị a niile m nyere unu taa. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu. A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ ONYENWE ANYị bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu. ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha. ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ. ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ga-eme ka ọbụbụ ọnụ ndị a bịakwasị ndị iro unu, ndị kpọrọ unu asị na ndị na-akpagbu unu. Unu ga-emesịakwa rubere ONYENWE ANYị isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa ONYENWE ANYị ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ. Ma ọ bụrụ na unu erubere ONYENWE ANYị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute ONYENWE ANYị bụ Chineke unu.