Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Diuteronomi 28:1-14

Diuteronomi 28:1-14 BIU

Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile ONYENWE ANYị Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, ONYENWE ANYị Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu. Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere ONYENWE ANYị Chineke gị isi. Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi. Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị. Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ. Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ. ONYENWE ANYị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga. ONYENWE ANYị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. ONYENWE ANYị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị. ONYENWE ANYị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu ONYENWE ANYị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile. Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha ONYENWE ANYị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu. ONYENWE ANYị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị. ONYENWE ANYị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla. ONYENWE ANYị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru. Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe.