Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Diuteronomi 18:9-22

Diuteronomi 18:9-22 BIU

Mgbe ị banyere nʼala ahụ ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị, amụtakwala ime omume arụ dịka ndị mba bi nʼala ahụ. Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja, maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ. Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye ONYENWE ANYị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka ONYENWE ANYị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a. Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu ONYENWE ANYị Chineke gị. Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma ONYENWE ANYị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ. Kama ONYENWE ANYị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị. Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ ONYENWE ANYị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu ONYENWE ANYị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.” Nʼihi ya, ONYENWE ANYị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma. Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha. Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike. Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.” I nwere ike ikwu nʼobi gị sị, “Olee otu anyị ga-esi mata na okwu e kwuru si nʼaka ONYENWE ANYị nʼezie?” Otu a ka unu ga-esi mata, ọ bụrụ na ihe onye amụma buru nʼamụma nʼaha ONYENWE ANYị emezughị, okwu ahụ esighị nʼebe ONYENWE ANYị nọ bịa. Ọ bụ okwu onye amụma ahụ chepụtara kwuo nʼonwe ya. Unu atụla ya ụjọ.