Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Daniel 6:1-4

Daniel 6:1-4 BIU

Ọ dị Daraiọs mma ịhọpụta ndịisi dị otu narị na iri abụọ, ndị ga-anọ nʼalaeze ahụ niile dịka ndị nnọchite anya eze. O họpụtakwara ndịisi atọ ọzọ dịka ndịisi ha, nke otu onye nʼime ha bụ Daniel. Ndị a bụ ndị ga na-agụkọrọ ha otu ihe si aga, ka ihe ọbụla ghara ifunarị eze. Ọ dịghị anya, ọ pụtara ihe nye eze na Daniel kwesiri ntụkwasị obi karịa ndịisi na ndị nlekọta ahụ niile. Nʼihi na amamihe ya, na ike ọrụ ya dị ukwuu. Nke a mere ka eze chee echiche kpebie ime ya onyeisi nʼalaeze niile. Nʼihi nke a, ndịisi ọkwa ha dị elu na ndịisi ndị ọzọ bidoro chọwa mkpesa ha ga-enye iji megide Daniel nʼihe gbasara ọchịchị. Ma ọ dịghị ihe ebubo ọbụla maọbụ omume ọjọọ ọbụla ha chọpụtara, nʼihi na ọ kwesiri ntụkwasị obi. Ọ dịghịkwa omume ọjọọ maọbụ nke aghụghọ ọbụla a chọpụtara nʼọrụ ya.