Daniel 4:35
Daniel 4:35 BIU
Mmadụ niile bi nʼụwa bụ ihe efu nʼihu ya. Nʼihi na ọ na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ nʼetiti usuu ndị bi nʼeluigwe, na nʼetiti ndị bi nʼụwa. O nweghị onye pụrụ igbochi ya, maọbụ onye pụrụ ịjụ ya sị ya, “Gịnị mere iji mee ihe ndị a?”

