Mgbe m dina nʼelu akwa, nke a bụ ihe m hụrụ. E nwere otu osisi nke toro nʼetiti ụwa, ogologo ya dị ukwuu. Osisi a toro sie ike, ịdị elu ya rukwara nʼeluigwe, a na-ahụkwa ya anya site na nsọtụ nke ụwa niile. Akwụkwọ ya dị mma ile anya, alaka ya jupụtakwara na mkpụrụ hiri nne, o gbokwara mkpa nri nye mmadụ niile. Ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na-abịakwa nʼokpuru ndo ya izuike. Ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe na-ebikwa nʼalaka ya. Ọ bụkwa site na ya ka a na-azụ ihe niile dị ndụ nri. “Mgbe m nọkwa na-arọ nrọ ahụ, ahụrụ m otu nʼime ndị mmụọ ozi Chineke ka o si nʼeluigwe na-arịdata. O tiri mkpu nʼolu dị ike sị, ‘Gbudanụ osisi ukwu ahụ, gbukasịakwa alaka ya niile. Kụpụsịanụ akwụkwọ ndụ niile dị nʼelu ya. Ghasaakwanụ mkpụrụ ya niile, ka ụmụ anụmanụ si nʼokpuru ndo ya gbapụ, ka ụmụ nnụnụ site nʼalaka ya fepụ. Kama hapụnụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya ka ha dịrị nʼime ala, ebe e ji ụdọ igwe na ụdọ bronz kee ya gburugburu, ebe ahịhịa ndụ gbakwara ya gburugburu. “ ‘Ka igirigi nke eluigwe zoo ya nʼahụ, ka ahịhịa bụrụkwa nri ọ ga-eri, ya na ụmụ anụmanụ. Ka uche ya gbanwee ghọọ nke anụ ọhịa, ghara ibu nke mmadụ, afọ asaa. “ ‘Nke a bụ mkpebi nke mmụọ ozi ahụ nọ na nche. Ọ bụkwa mkpebi e nyere site nʼokwu nke dị nsọ, ka ụwa niile mata na Onye kachasị ihe niile elu, na-achịkwa nʼalaeze niile dị nʼụwa. Ọ bụ ya na-ewerekwa alaeze ndị a nye onye ọbụla ọ chọrọ, ọ bụladị ndị mmadụ a na-ahụta dịka ndị dị ala karịsịa.’ “Nke a bụ nrọ ahụ, mụ bụ eze Nebukadneza rọrọ, ugbu a, Belteshaza, gwa m ihe bụ nkọwa ya. Nʼihi na ndị amamihe niile nọ nʼalaeze m enweghị ike ịkọwara m ya. Ma amaara m na i nwere ike ịkọwara m ya, nʼihi na mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ dị nʼime gị.”
Gụọ Daniel 4
Geere nke a ntị Daniel 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Daniel 4:10-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo