Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi. Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ. Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi. Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nʼihi ihe ọjọọ niile o mere. Nʼihi na ile mmadụ anya nʼihu adịghị ya.
Gụọ Ndị Kọlọsị 3
Geere nke a ntị Ndị Kọlọsị 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ndị Kọlọsị 3:22-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị